Matiu 13:56
Matthew 13:56 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụnne ya ndị inyom niile, ha anọghị nʼetiti anyị?* Olee ebekwa ka nwoke a si nweta ihe ndị a?”
Matthew 13:56 in English
Matthew 13:56 · Berean Standard Bible
Aren’t all His sisters with us as well? Where then did this man get all these things?”
Context
54O rutere nʼobodo ya, malite izi ha ihe nʼụlọ ekpere ha, nke a jukwara ha anya. Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ na-asị, “Ebee ka o si nweta amamihe a? Ebee ka o si nweta ike ịrụ ọrụ ebube ndị a niile? 55Nwoke a, ọ bụghị nwa onye kapinta? Ọ bụ na-adịghị akpọ nne ya Meri? Jemis, Josef, Saimọn na Judas, ha abụghị ụmụnne ya ndị ikom? 56Ụmụnne ya ndị inyom niile, ha anọghị nʼetiti anyị?* Olee ebekwa ka nwoke a si nweta ihe ndị a?” 57Iwe were ha nʼebe ọ nọ.
Ma Jisọs gwara ha okwu sị ha, “A na-asọpụrụ onye amụma nʼebe niile, ma a dịghị asọpụrụ ya nʼobodo a mụrụ ya, nakwa nʼezinaụlọ nke ya.” 58Ya mere, ọ rụghị ọtụtụ ọrụ ebube nʼebe ahụ, nʼihi na ha enweghị okwukwe nʼime ha.
13:15 Aịz 6:9,10
13:24 Ezi mkpụrụ bụ Oziọma ahụ.
13:33 Maọbụ, yiist
13:35 Abụ 78:2
13:56 Ọ bụ na anyị amakwaghị ụmụnne ya ndị inyom, ndị anyị na ha bi nʼebe a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.