Matiu 13:53
Matthew 13:53 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Jisọs tụsịrị ilu ndị a, o si ebe ahụ pụọ.
Matthew 13:53 in English
Matthew 13:53 · Berean Standard Bible
When Jesus had finished these parables, He withdrew from that place.
Context
51Ọ jụrụ ha sị, “Unu ghọtara ihe ndị a m na-ekwu?”
Ha zara sị ya, “E.” 52Ọ sịrị ha, “Nʼihi nke a, onye nkuzi nke iwu ọbụla nke e mere ka ọ bụrụ onye na-eso ụzọ alaeze eluigwe, dị ka onyenwe ụlọ nke na-esite nʼụlọakụ ya na-ewepụta ihe ọhụrụ na ihe ochie.” 53Mgbe Jisọs tụsịrị ilu ndị a, o si ebe ahụ pụọ. 54O rutere nʼobodo ya, malite izi ha ihe nʼụlọ ekpere ha, nke a jukwara ha anya. Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ na-asị, “Ebee ka o si nweta amamihe a? Ebee ka o si nweta ike ịrụ ọrụ ebube ndị a niile? 55Nwoke a, ọ bụghị nwa onye kapinta? Ọ bụ na-adịghị akpọ nne ya Meri? Jemis, Josef, Saimọn na Judas, ha abụghị ụmụnne ya ndị ikom?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.