Matiu 1:21
Matthew 1:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs,* nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha.”
Matthew 1:21 in English
Matthew 1:21 · Berean Standard Bible
She will give birth to a Son, and you are to give Him the name Jesus,* because He will save His people from their sins.”
Context
19Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, ọ chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo. 20Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ. 21Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs,* nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha.” 22Ihe ndị a mere iji mezuo ihe ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma ya sị, 23“Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel”* (nke bụ ma asụgharịa ya, “Chineke nọnyeere anyị”).
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.