Native Bible

Malachi 1:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ma Ịsọ ka m kpọrọ asị, mee ugwu ya niile ka ha ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu, werekwa ihe nketa ya nye nkịta ọhịa niile nke ọzara.”

Malachi 1:3 in English

Malachi 1:3 · Berean Standard Bible

but Esau I have hated,* and I have made his mountains a wasteland and left his inheritance to the desert jackals.*”

Context

1Okwu amụma: Nke a bụ okwu Onyenwe anyị gwara Izrel site nʼọnụ Malakaị onye amụma. 2“Ahụla m unu nʼanya,” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “Ma unu na-asị, ‘Olee ụzọ i si hụ anyị nʼanya?’ “Ịsọ, ọ bụghị nwanne Jekọb?” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ma otu ọ dị, ahụrụ m Jekọb nʼanya, 3ma Ịsọ ka m kpọrọ asị, mee ugwu ya niile ka ha ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu, werekwa ihe nketa ya nye nkịta ọhịa niile nke ọzara.” 4Ndị Edọm nwere ike sị, “Ọ bụ ezie na e tikpọọla anyị, ma anyị ga-ewugharị nkpọnkpọ ebe niile.” Ma otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu, “Ha nwere ike wugharịa ya, ma aga m akwadakwa ha ọzọ. Nʼihi na a ga-akpọ ha Obodo ihe ọjọọ, ndị Onyenwe anyị na-eweso iwe ruo mgbe ebighị ebi. 5Anya unu ga-ahụ nke a ma unu ga-ekwukwa, ‘Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ bụladị ruo nʼofe oke ala Izrel!’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.