Malakaị 1:4
Malachi 1:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị Edọm nwere ike sị, “Ọ bụ ezie na e tikpọọla anyị, ma anyị ga-ewugharị nkpọnkpọ ebe niile.” Ma otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu, “Ha nwere ike wugharịa ya, ma aga m akwadakwa ha ọzọ. Nʼihi na a ga-akpọ ha Obodo ihe ọjọọ, ndị Onyenwe anyị na-eweso iwe ruo mgbe ebighị ebi.
Malachi 1:4 in English
Malachi 1:4 · Berean Standard Bible
Though Edom may say, “We have been devastated, but we will rebuild the ruins,” this is what the LORD of Hosts says: “They may build, but I will demolish. They will be called the Land of Wickedness, and a people with whom the LORD is indignant forever.
Context
2“Ahụla m unu nʼanya,” ka Onyenwe anyị na-ekwu.
“Ma unu na-asị, ‘Olee ụzọ i si hụ anyị nʼanya?’
“Ịsọ, ọ bụghị nwanne Jekọb?” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ma otu ọ dị, ahụrụ m Jekọb nʼanya, 3ma Ịsọ ka m kpọrọ asị, mee ugwu ya niile ka ha ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu, werekwa ihe nketa ya nye nkịta ọhịa niile nke ọzara.” 4Ndị Edọm nwere ike sị, “Ọ bụ ezie na e tikpọọla anyị, ma anyị ga-ewugharị nkpọnkpọ ebe niile.”
Ma otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu, “Ha nwere ike wugharịa ya, ma aga m akwadakwa ha ọzọ. Nʼihi na a ga-akpọ ha Obodo ihe ọjọọ, ndị Onyenwe anyị na-eweso iwe ruo mgbe ebighị ebi. 5Anya unu ga-ahụ nke a ma unu ga-ekwukwa, ‘Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ bụladị ruo nʼofe oke ala Izrel!’ ” 6“Nwa na-asọpụrụ nna ya, ohu na asọpụrụkwa onyenwe ya. A sị na m bụ nna, ebee ka egwu m dị. A sị na m bụ onyenwe mmadụ, ebee ka nsọpụrụ m dị?” Ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
“Ọ bụ unu ndị nchụaja na-eleda aha m anya.
“Ma unu na-ajụ, ‘Olee ụzọ anyị si eleda aha gị anya?’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.