Luk 8:11
Luke 8:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nke a bụ nkọwa ilu ahụ. Mkpụrụ ahụ bụ okwu Chineke.
Luke 8:11 in English
Luke 8:11 · Berean Standard Bible
Now this is the meaning of the parable: The seed is the word of God.
Context
9Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ihe ilu a pụtara. 10Ọ sịrị, “Ọ bụ unu ka e nyere ịmata ihe omimi niile nke alaeze Chineke, ma ndị ọzọ ga-anụ ya naanị nʼilu. Site nʼụzọ dị otu a,
“ ‘ha ga na-ele anya, ma ha agaghị ahụ ihe ọbụla.
Ha ga na-anụ ntị ma ha agaghị aghọta ihe ọbụla.’* 11“Nke a bụ nkọwa ilu ahụ. Mkpụrụ ahụ bụ okwu Chineke. 12Mkpụrụ dara nʼakụkụ ụzọ nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke, ma ekwensu bịara napụ ha okwu ahụ nʼobi ha, ka ha ghara ikwere ma nwetakwa nzọpụta. 13Mkpụrụ ndị ahụ dara nʼelu nkume nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke jiri ọṅụ nabata ya, ma ha enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha. Ha na-ekwere naanị nwa oge nta, ma mgbe ọnwụnwa bịara ha na-adachapụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.