Native Bible

Luke 7:49 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ndị ọzọ soro ya nọdụ na-eri nri bidoro ikwu nʼetiti onwe ha na-asị, “Onye bụ onye a nwere ike ọ bụladị ịgbaghara mmehie?”

Luke 7:49 in English

Luke 7:49 · Berean Standard Bible

But those at the table began to say to themselves, “Who is this who even forgives sins?”

Context

47Ya mere, ana m agwa gị sị, a gbagharala ya mmehie ya niile o mehiere, nʼihi na ọ nwere ịhụnanya dị ukwuu. Ma onye nwetara mgbaghara dị nta, na-enwe ịhụnanya dị nta.” 48Mgbe ahụ ọ gwara ya sị, “A gbagharala gị mmehie gị.” 49Ma ndị ọzọ soro ya nọdụ na-eri nri bidoro ikwu nʼetiti onwe ha na-asị, “Onye bụ onye a nwere ike ọ bụladị ịgbaghara mmehie?” 50Ọ sịrị nwanyị ahụ, “Okwukwe gị azọpụtala gị, laa nʼudo.” 7:2 Ọ bụ onye Rom. 7:27 Mal 3:1

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.