Native Bible

Luke 5:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ hụrụ nʼọnụ mmiri ahụ, ụgbọ mmiri abụọ nke ndị ọkụ azụ nwe ha hapụrụ gaa ịsa ụgbụ ha ji egbu azụ.

Luke 5:2 in English

Luke 5:2 · Berean Standard Bible

He saw two boats at the edge of the lake. The fishermen had left them and were washing their nets.

Context

1Otu oge, ka Jisọs guzo nʼakụkụ ọdọ mmiri Genesaret.* Igwe mmadụ gbara ya gburugburu ka ha nụrụ okwu Chineke. 2Ọ hụrụ nʼọnụ mmiri ahụ, ụgbọ mmiri abụọ nke ndị ọkụ azụ nwe ha hapụrụ gaa ịsa ụgbụ ha ji egbu azụ. 3Ọ banyere nʼime otu ụgbọ mmiri ndị ahụ, nke bụ nke Saimọn, ọ rịọrọ ya ka ọ kwọrọ ya banyetụ ntakịrị nʼime mmiri. Ọ nọdụrụ ala nʼime ya bido na-ezi igwe mmadụ ihe. 4Mgbe o kwusiri okwu, ọ gwara Saimọn sị, “Banyetụkwuo nʼime mmiri, tụnye ụgbụ gị ka i gbute azụ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.