Native Bible

Luke 5:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu oge, ka Jisọs guzo nʼakụkụ ọdọ mmiri Genesaret.* Igwe mmadụ gbara ya gburugburu ka ha nụrụ okwu Chineke.

Luke 5:1 in English

Luke 5:1 · Berean Standard Bible

On one occasion, while Jesus was standing by the Lake of Gennesaret * with the crowd pressing in on Him to hear the word of God,

Context

1Otu oge, ka Jisọs guzo nʼakụkụ ọdọ mmiri Genesaret.* Igwe mmadụ gbara ya gburugburu ka ha nụrụ okwu Chineke. 2Ọ hụrụ nʼọnụ mmiri ahụ, ụgbọ mmiri abụọ nke ndị ọkụ azụ nwe ha hapụrụ gaa ịsa ụgbụ ha ji egbu azụ. 3Ọ banyere nʼime otu ụgbọ mmiri ndị ahụ, nke bụ nke Saimọn, ọ rịọrọ ya ka ọ kwọrọ ya banyetụ ntakịrị nʼime mmiri. Ọ nọdụrụ ala nʼime ya bido na-ezi igwe mmadụ ihe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.