Native Bible

Luke 23:51 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ kwadoghị mkpebi ha na omume ha. Onye sitere Arimatia, nʼotu obodo ndị Juu, onye na-echere ọbịbịa nke alaeze Chineke.

Luke 23:51 in English

Luke 23:51 · Berean Standard Bible

who had not consented to their decision or action. He was from the Judean town of Arimathea, and was waiting for the kingdom of God.

Context

49Ma ndị niile maara onye ọ bụ, tinyekwara ụmụ nwanyị ndị soro ya si Galili bịa, guzokwara nʼebe dị anya na-ele ihe ndị a. 50O nwere otu nwoke aha ya bụ Josef, onye so nʼotu ndịisi ụlọ nzukọ. Ọ bụ ezigbo mmadụ na onye aka ya kwụ ọtọ. 51Ọ kwadoghị mkpebi ha na omume ha. Onye sitere Arimatia, nʼotu obodo ndị Juu, onye na-echere ọbịbịa nke alaeze Chineke. 52Nwoke a gakwuru Pailet rịọọ ka e bunye ya ahụ Jisọs.* 53Ya mere, o budatara ya fụchie ya nʼakwa ọcha linin, tinye ya nʼili e gwuru nʼọgba nkume, nke a na-etinyebeghị mmadụ na mbụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.