Luk 23:28
Luke 23:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Jisọs tụgharịrị sị ha, “Ụmụada Jerusalem, unu eberela m akwa, kama beerenụ onwe unu na ụmụ unu.
Luke 23:28 in English
Luke 23:28 · Berean Standard Bible
But Jesus turned to them and said, “Daughters of Jerusalem, do not weep for Me, but weep for yourselves and for your children.
Context
26Dị ka ha duu ya na-aga, ha jidere Saimọn onye Sirini bụ onye si nʼime otu obodo nta na-alọbata; ha boro ya obe ahụ, manye ya ka o buru ya na-eso Jisọs na-azụ. 27Igwe mmadụ dị ukwuu soro ya tinyekwara ụmụ nwanyị bụ ndị tiri mkpu akwa ma ruokwara ya ụjụ. 28Ma Jisọs tụgharịrị sị ha, “Ụmụada Jerusalem, unu eberela m akwa, kama beerenụ onwe unu na ụmụ unu. 29Nʼihi na oge na-abịa mgbe unu ga-asị, ‘Ngọzị na-adịrị ụmụ nwanyị aga, akpanwa ndị na-amụghị nwa, na ara ndị na-enweghị onye ṅụrụ ha.’ 30Mgbe ahụ,
“ ‘ha ga-asị, ugwu ukwu niile, “Dakwasị anyị!”*
Sịkwa, ugwu nta, “Kpuchite anyị!” ’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.