Luk 22:68
Luke 22:68 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụkwa na m ajụọ unu ajụjụ, unu agaghị aza m.
Luke 22:68 in English
Luke 22:68 · Berean Standard Bible
And if I ask you a question, you will not answer.
Context
66Mgbe chi bọrọ, nzukọ ndị okenye na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu zukọtara, a kpọtakwara Jisọs nʼihu ha. 67Ha na-ekwu, “Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst, gwa anyị.”
Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na m agwa unu, unu agaghị ekwe. 68Ọ bụrụkwa na m ajụọ unu ajụjụ, unu agaghị aza m. 69Ma site ugbu a gawa, Nwa nke Mmadụ ga-anọdụ ala nʼaka nri nke ike Chineke.” 70Ha niile sịrị, “Gị onwe gị, ị bụ Ọkpara Chineke?”
Ọ sịrị ha, “Unu kwuru na Abụ m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.