Native Bible

Luke 22:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma lee, onye ahụ nke ga-arara m nye nọnyeere m, o sokwa m na-eri nri.

Luke 22:21 in English

Luke 22:21 · Berean Standard Bible

Look! The hand of My betrayer is with Mine on the table.

Context

19O werekwara otu ogbe achịcha, mgbe o nyechara ekele, ọ nyawaa ya nye ha sị, “Nke a bụ ahụ m nke e nyere nʼihi unu. Na-emenụ nke a iji na-echeta m.” 20Nʼotu ụzọ ahụ, mgbe ha risiri nri anyasị o buuru iko sị, “Iko a bụ iko nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ nʼọbara m, nke a na-awụpụ nʼihi unu. 21Ma lee, onye ahụ nke ga-arara m nye nọnyeere m, o sokwa m na-eri nri. 22Nwa nke Mmadụ na-aga ịnwụ dị ka e kpebiri ya, ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ a ga-esi nʼaka ya rara ya nye.” 23Ha bidoro ịjụrịta onwe ha onye ọ bụ nʼetiti ha ga-eme nke a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.