Native Bible

Luke 20:44 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid nʼonwe ya kpọrọ ya ‘Onyenwe anyị.’ Oleekwanụ otu o si bụrụ nwa ya?”

Luke 20:44 in English

Luke 20:44 · Berean Standard Bible

Thus David calls Him ‘Lord.’ So how can He be David’s son?”

Context

42Devid nʼonwe ya kwupụtara nʼakwụkwọ Abụ Ọma, sị: “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m, “Nọdụ ala nʼaka nri m 43ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.” ’* 44Devid nʼonwe ya kpọrọ ya ‘Onyenwe anyị.’ Oleekwanụ otu o si bụrụ nwa ya?” 45Mgbe ndị mmadụ na-ege ntị, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, 46“Kpacharanụ anya nʼebe ndị ozizi iwu nọ. Ndị iyi uwe mwụda na-ejegharị ebe niile na-amasị, ndị hụrụ ekele pụrụ iche bụ nke a na-ekele ha nʼọma ahịa nʼanya. Ndị ọ na-amasịkwa ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nakwa nʼoche pụrụ iche na mmemme oriri ọbụla.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.