Levitikọs 5:15
Leviticus 5:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Mgbe onye ọbụla sitere na-amaghị ama mehie, merụọ ihe nsọ niile nke Onyenwe anyị, bụrụ onye nke nʼekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị. Ọ ga-ewetara Onyenwe anyị otu ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, dịka ọnụahịa ya si dị nʼọlaọcha, nʼusoro shekel nke ebe nsọ.* Ọ bụ aja ikpe ọmụma.
Leviticus 5:15 in English
Leviticus 5:15 · Berean Standard Bible
“If someone acts unfaithfully and sins unintentionally against any of the LORD’s holy things, he must bring his guilt offering to the LORD: an unblemished ram from the flock, of proper value * in silver shekels according to the sanctuary shekel;* it is a guilt offering.
Context
13Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-achụrụ ya aja ikpuchi mmehie ya niile. A ga-agbagharakwa ya. Ụtụ ọka fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja, dịka e si mee ya nʼaja onyinye mkpụrụ ọka.’ ” 14Onyenwe anyị gwara Mosis sị, 15“Mgbe onye ọbụla sitere na-amaghị ama mehie, merụọ ihe nsọ niile nke Onyenwe anyị, bụrụ onye nke nʼekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị. Ọ ga-ewetara Onyenwe anyị otu ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, dịka ọnụahịa ya si dị nʼọlaọcha, nʼusoro shekel nke ebe nsọ.* Ọ bụ aja ikpe ọmụma. 16Ọ ga-akwụghachikwa ụgwọ ihe nsọ ndị ahụ niile nke ọ na-emezughị. Ọ ga-atụkwasị otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ya nʼelu ya, were ha niile nye onye nchụaja. Onye nchụaja ahụ ga-ewere ebule ahụ na ihe ndị a chụọrọ ya aja mkpuchi mmehie, nʼihi ikpe ọmụma ya. A ga-agbagharakwa ya. 17“Ma ọ bụrụ na mmadụ ọbụla emehie, mee ihe ọbụla megidere iwu ọbụla Onyenwe anyị nyere, ọ bụ ezie na e mere mmehie a na-amaghị ama, ma ikpe mara ha, ọ ga-atakwa ahụhụ soo ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.