Levitikọs 26:29
Leviticus 26:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ga-eri anụ ụmụ unu ndị ikom, na anụ ụmụ unu ndị inyom.
Leviticus 26:29 in English
Leviticus 26:29 · Berean Standard Bible
You will eat the flesh of your own sons and daughters.
Context
27“ ‘Ọ bụrụkwa na unu agaa nʼihu jụ ige m ntị nʼagbanyeghị ihe ndị a, nọgide na-emegide m, 28mgbe ahụ, aga m egosi unu oke iwe m, nye unu ntaramahụhụ dị okpukpu asaa nʼihi mmehie unu. 29Unu ga-eri anụ ụmụ unu ndị ikom, na anụ ụmụ unu ndị inyom. 30Aga m ebibikwa ụlọ arụsị unu niile dị nʼelu ugwu, gbutuo ebe ịchụ aja niile unu na-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi. Aga m atụkọta ozu unu nʼelu arụsị unu na-enweghị ume ndụ, ka unu bụrụ ihe m na-asọ oyi. 31Aga m eme ka obodo unu niile tọgbọrọ nʼefu, kụdasịakwa ebe nsọ unu niile. Agaghị m anabatakwa isisi ụtọ nke aja unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.