Levitikọs 26:27
Leviticus 26:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ọ bụrụkwa na unu agaa nʼihu jụ ige m ntị nʼagbanyeghị ihe ndị a, nọgide na-emegide m,
Leviticus 26:27 in English
Leviticus 26:27 · Berean Standard Bible
But if in spite of all this you do not obey Me, but continue to walk in hostility toward Me,
Context
25Aga m ewebata mma agha nʼebe unu nọ, ịbọ ọbọ nʼihi ọgbụgba ndụ m unu mebiri. Mgbe unu ga-agba ọsọ gbaba nʼobodo unu, aga m ezite ihe mbibi ga-ebibi unu nʼebe ahụ. Aga m enyefekwa unu nʼaka ndị iro unu. 26Aga m eme ka unu hapụ inwe ihe oriri ga-ezuru unu. Otu ite nri naanị ka ndị inyom iri ga-eji sie nri ha nwere. Ha ga-eji ihe ọtụtụ tụọ ya mgbe ha na-eke ya. Unu ga-eri ya, ma afọ agaghị eju unu. 27“ ‘Ọ bụrụkwa na unu agaa nʼihu jụ ige m ntị nʼagbanyeghị ihe ndị a, nọgide na-emegide m, 28mgbe ahụ, aga m egosi unu oke iwe m, nye unu ntaramahụhụ dị okpukpu asaa nʼihi mmehie unu. 29Unu ga-eri anụ ụmụ unu ndị ikom, na anụ ụmụ unu ndị inyom.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.