Native Bible

Leviticus 21:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gụọ ha dịka ndị dị nsọ nʼihi na ọ bụ ha na-eche nri Chineke nʼihu ya. Gụọ ha dịka ndị dị nsọ nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị dị nsọ, mụ onwe m na-eme ka unu dị nsọ.

Leviticus 21:8 in English

Leviticus 21:8 · Berean Standard Bible

You are to regard him as holy, since he presents the food of your God. He shall be holy to you, because I the LORD am holy—I who set you apart.

Context

6Ha ga-abụ ndị dị nsọ nye Chineke ha, ndị na-agaghị emekwa ka aha Chineke ha ghara ịdị nsọ. Nʼihi na ọ bụ ha na-eche nʼihu Onyenwe anyị onyinye aja nsure ọkụ, bụ nri Chineke ha. Nʼihi ya, ha aghaghị ịdị nsọ. 7“ ‘Onye nchụaja agaghị alụ nwanyị e merụrụ site nʼịgba akwụna, maọbụ nwanyị lụtụrụla di nke kewapụrụ onwe ya site nʼahụ di ya, nʼihi na ndị nchụaja bụ ndị dị nsọ nye Chineke ha. 8Gụọ ha dịka ndị dị nsọ nʼihi na ọ bụ ha na-eche nri Chineke nʼihu ya. Gụọ ha dịka ndị dị nsọ nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị dị nsọ, mụ onwe m na-eme ka unu dị nsọ. 9“ ‘Ọ bụrụ na nwa nwanyị onye nchụaja emerụọ onwe ya site nʼịghọ onye akwụna, o sitela na ndụ ọjọọ dị otu a wetara nna ya ihe ihere. A ga-akpọ ya ọkụ. 10“ ‘Onyeisi nchụaja, onye ahụ sitere nʼetiti ụmụnna ya, onye awụsara mmanụ nsọ nʼisi ya, onye ahọrọ doo nsọ iyiri uwe onye nchụaja ahụ, agaghị ahapụ agịrị isi ya ka ọ kpasasịa, maọbụ dọwaa uwe ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.