Levitikọs 2:14
Leviticus 2:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ọ bụrụ na onyinye mkpụrụ ọka ị na-ewetara Onyenwe anyị bụ mkpụrụ mbụ nke ubi gị, site nʼọka ọhụrụ gị weta ọka a sụrụ asụ, maọbụ nke a hụrụ nʼọkụ.
Leviticus 2:14 in English
Leviticus 2:14 · Berean Standard Bible
If you bring a grain offering of firstfruits to the LORD, you shall offer crushed heads of new grain roasted on the fire.
Context
12Unu nwere ike nye Onyenwe anyị achịcha e ji ihe na-eko achịcha na mmanụ aṅụ mee nʼoge onyinye owuwe ihe ubi, ma a gaghị eme otu a nʼoge onyinye ọchụchụ aja nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ. 13Unu aghaghị itinye nnu* nʼime onyinye mkpụrụ ọka ọbụla unu na-enye. Unu ahapụla ọgbụgba ndụ Chineke unu nʼonyinye mkpụrụ ọka unu. Tinyenụ nnu nʼonyinye unu niile. 14“ ‘Ọ bụrụ na onyinye mkpụrụ ọka ị na-ewetara Onyenwe anyị bụ mkpụrụ mbụ nke ubi gị, site nʼọka ọhụrụ gị weta ọka a sụrụ asụ, maọbụ nke a hụrụ nʼọkụ. 15Tinye ya mmanụ na ụda na-esi isi ụtọ. Ọ ga-abụ onyinye ọka. 16Onye nchụaja ga-ewere oke ncheta nʼime ọka ahụ a sụrụ asụ, nke a gwara mmanụ na ụda na-esi isi ụtọ, dịka onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
2:2 Nke nọchiri anya ụtụ ọka ahụ niile
2:4 Ihe na-eko achịcha Ọ bụ naanị nʼoge aja udo na mmemme izu asaa, ka a na-etinye ihe na-eko achịcha nʼụtụ ọka a na-eweta. Lev 7:13; 23:17
2:13 Nnu Nnu na-echekwa ihe ka ọ ghara imebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.