Levitikọs 2:13
Leviticus 2:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu aghaghị itinye nnu* nʼime onyinye mkpụrụ ọka ọbụla unu na-enye. Unu ahapụla ọgbụgba ndụ Chineke unu nʼonyinye mkpụrụ ọka unu. Tinyenụ nnu nʼonyinye unu niile.
Leviticus 2:13 in English
Leviticus 2:13 · Berean Standard Bible
And you shall season each of your grain offerings with salt. You must not leave the salt of the covenant of your God out of your grain offering; you are to add salt to each of your offerings.
Context
11“ ‘Unu etinyela ihe na-eko ọka ọbụla nʼonyinye mkpụrụ ọka unu na-enye Onyenwe anyị, nʼihi na unu ekwesighị ịkpọ ihe na-eko achịcha maọbụ mmanụ aṅụ ọkụ nʼonyinye nsure ọkụ unu na-enye Onyenwe anyị. 12Unu nwere ike nye Onyenwe anyị achịcha e ji ihe na-eko achịcha na mmanụ aṅụ mee nʼoge onyinye owuwe ihe ubi, ma a gaghị eme otu a nʼoge onyinye ọchụchụ aja nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ. 13Unu aghaghị itinye nnu* nʼime onyinye mkpụrụ ọka ọbụla unu na-enye. Unu ahapụla ọgbụgba ndụ Chineke unu nʼonyinye mkpụrụ ọka unu. Tinyenụ nnu nʼonyinye unu niile. 14“ ‘Ọ bụrụ na onyinye mkpụrụ ọka ị na-ewetara Onyenwe anyị bụ mkpụrụ mbụ nke ubi gị, site nʼọka ọhụrụ gị weta ọka a sụrụ asụ, maọbụ nke a hụrụ nʼọkụ. 15Tinye ya mmanụ na ụda na-esi isi ụtọ. Ọ ga-abụ onyinye ọka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.