Native Bible

Leviticus 18:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Debenụ iwu m na ụkpụrụ m, nʼihi na onye na-edebe ha ga-adị ndụ* site na ha. Abụ m Onyenwe anyị.

Leviticus 18:5 in English

Leviticus 18:5 · Berean Standard Bible

Keep My statutes and My judgments, for the man who does these things will live by them.* I am the LORD.

Context

3Ya mere, ọ bụ ezie na unu ebiela nʼetiti ndị Ijipt, ma unu ekwesighị ibi ndụ unu dịka ha si ebi. Unu ekwesịkwaghị ibi ndụ dịka ndị Kenan ebe m na-akpọbata unu. Unu agbasola omenaala ha. 4Unu ga-edebe iwu m niile, gbasookwa ụkpụrụ m niile nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu. 5Debenụ iwu m na ụkpụrụ m, nʼihi na onye na-edebe ha ga-adị ndụ* site na ha. Abụ m Onyenwe anyị. 6“ ‘Onye ọbụla ya na mmadụ bụ nwanne e jekwurukwala ya ka ha nwe mmekọ edina, i ji kpughee ọtọ ya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 7“ ‘Ị gaghị eleda nna gị anya site na i jekwuru nne gị ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nne gị ka ọ bụ; gị na ya agaghị enwe ụdị mmekọ dị otu a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.