Native Bible

Leviticus 18:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, ọ bụ ezie na unu ebiela nʼetiti ndị Ijipt, ma unu ekwesighị ibi ndụ unu dịka ha si ebi. Unu ekwesịkwaghị ibi ndụ dịka ndị Kenan ebe m na-akpọbata unu. Unu agbasola omenaala ha.

Leviticus 18:3 in English

Leviticus 18:3 · Berean Standard Bible

You must not follow the practices of the land of Egypt, where you used to live, and you must not follow the practices of the land of Canaan, into which I am bringing you. You must not walk in their customs.

Context

1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 2“Gwa ụmụ Izrel okwu ndị a sị ha, ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu. 3Ya mere, ọ bụ ezie na unu ebiela nʼetiti ndị Ijipt, ma unu ekwesighị ibi ndụ unu dịka ha si ebi. Unu ekwesịkwaghị ibi ndụ dịka ndị Kenan ebe m na-akpọbata unu. Unu agbasola omenaala ha. 4Unu ga-edebe iwu m niile, gbasookwa ụkpụrụ m niile nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu. 5Debenụ iwu m na ụkpụrụ m, nʼihi na onye na-edebe ha ga-adị ndụ* site na ha. Abụ m Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.