Native Bible

Leviticus 18:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu ga-edebe iwu m niile, gbasookwa ụkpụrụ m niile nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.

Leviticus 18:4 in English

Leviticus 18:4 · Berean Standard Bible

You are to practice My judgments and keep My statutes by walking in them. I am the LORD your God.

Context

2“Gwa ụmụ Izrel okwu ndị a sị ha, ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu. 3Ya mere, ọ bụ ezie na unu ebiela nʼetiti ndị Ijipt, ma unu ekwesighị ibi ndụ unu dịka ha si ebi. Unu ekwesịkwaghị ibi ndụ dịka ndị Kenan ebe m na-akpọbata unu. Unu agbasola omenaala ha. 4Unu ga-edebe iwu m niile, gbasookwa ụkpụrụ m niile nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu. 5Debenụ iwu m na ụkpụrụ m, nʼihi na onye na-edebe ha ga-adị ndụ* site na ha. Abụ m Onyenwe anyị. 6“ ‘Onye ọbụla ya na mmadụ bụ nwanne e jekwurukwala ya ka ha nwe mmekọ edina, i ji kpughee ọtọ ya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.