Levitikọs 17:12
Leviticus 17:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi nke a, a sịrị ndị Izrel, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti unu, maọbụ onye ọbịa ọbụla nke bi nʼetiti unu ga-eri ọbara.”
Leviticus 17:12 in English
Leviticus 17:12 · Berean Standard Bible
Therefore I say to the Israelites, ‘None of you may eat blood, nor may any foreigner living among you eat blood.’
Context
10“ ‘Onye Izrel ọbụla maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti ha, nke riri ọbara ọbụla ka m ga-eche ihu m megide. A ga-ewezuga ya site nʼetiti ndị m. 11Nʼihi na ndụ ihe nwere ndụ dị nʼọbara ya, ọ bụ nʼihi nke a ka m ji nye iwu na a ga-awụsa ọbara niile nʼelu ebe ịchụ aja, maka iji ya kpuchie mmehie unu. Ọ bụ ọbara na-ekpuchi mmehie maka ndụ mmadụ.* 12Nʼihi nke a, a sịrị ndị Izrel, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti unu, maọbụ onye ọbịa ọbụla nke bi nʼetiti unu ga-eri ọbara.” 13“ ‘Onye Izrel ọbụla, na onye ọbịa ọbụla binyere unu nke gara ịchụ nta, gbuo anụ maọbụ nnụnụ ọbụla a na-eri eri, ga-awụfu ọbara ya were aja kpuchie ya. 14Nʼihi na ndụ ihe niile nwere ndụ dị nʼọbara. Ọ bụ ya mere m ji nye ụmụ Izrel iwu si unu erila ọbara anụmanụ ọbụla, nʼihi na ndụ ihe niile nwere ndụ dị nʼọbara ya. Nʼihi ya onye ọbụla riri ọbara, a ga-ekewapụ ya site nʼetiti ndị m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.