Native Bible

Leviticus 17:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Onye Izrel ọbụla, na onye ọbịa ọbụla binyere unu nke gara ịchụ nta, gbuo anụ maọbụ nnụnụ ọbụla a na-eri eri, ga-awụfu ọbara ya were aja kpuchie ya.

Leviticus 17:13 in English

Leviticus 17:13 · Berean Standard Bible

And if any Israelite or foreigner living among them hunts down a wild animal or bird that may be eaten, he must drain its blood and cover it with dirt.

Context

11Nʼihi na ndụ ihe nwere ndụ dị nʼọbara ya, ọ bụ nʼihi nke a ka m ji nye iwu na a ga-awụsa ọbara niile nʼelu ebe ịchụ aja, maka iji ya kpuchie mmehie unu. Ọ bụ ọbara na-ekpuchi mmehie maka ndụ mmadụ.* 12Nʼihi nke a, a sịrị ndị Izrel, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti unu, maọbụ onye ọbịa ọbụla nke bi nʼetiti unu ga-eri ọbara.” 13“ ‘Onye Izrel ọbụla, na onye ọbịa ọbụla binyere unu nke gara ịchụ nta, gbuo anụ maọbụ nnụnụ ọbụla a na-eri eri, ga-awụfu ọbara ya were aja kpuchie ya. 14Nʼihi na ndụ ihe niile nwere ndụ dị nʼọbara. Ọ bụ ya mere m ji nye ụmụ Izrel iwu si unu erila ọbara anụmanụ ọbụla, nʼihi na ndụ ihe niile nwere ndụ dị nʼọbara ya. Nʼihi ya onye ọbụla riri ọbara, a ga-ekewapụ ya site nʼetiti ndị m. 15“ ‘Mmadụ ọbụla, maọbụ nwa afọ ma ọ bụkwanụ onye ọbịa, nke riri anụ nwụrụ nʼonwe ya, maọbụ nke anụ ọhịa dọgburu,* ga-eji mmiri saa uwe ya na ahụ ya, ọ ga-abụkwa onye rụrụ arụ ruo uhuruchi tupu ọ dị ọcha ọzọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.