Levitikọs 17:10
Leviticus 17:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Onye Izrel ọbụla maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti ha, nke riri ọbara ọbụla ka m ga-eche ihu m megide. A ga-ewezuga ya site nʼetiti ndị m.
Leviticus 17:10 in English
Leviticus 17:10 · Berean Standard Bible
If anyone from the house of Israel or a foreigner living among them eats any blood, I will set My face against that person and cut him off from among his people.
Context
8“Gwa ha, ‘Onye Izrel ọbụla, maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti unu, nke ga-achụ aja nsure ọkụ maọbụ aja ọzọ, 9ma o webataghị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, ebe a ga-achụrụ ya Onyenwe anyị, ka a ga-ewezuga site nʼetiti ndị ya. 10“ ‘Onye Izrel ọbụla maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti ha, nke riri ọbara ọbụla ka m ga-eche ihu m megide. A ga-ewezuga ya site nʼetiti ndị m. 11Nʼihi na ndụ ihe nwere ndụ dị nʼọbara ya, ọ bụ nʼihi nke a ka m ji nye iwu na a ga-awụsa ọbara niile nʼelu ebe ịchụ aja, maka iji ya kpuchie mmehie unu. Ọ bụ ọbara na-ekpuchi mmehie maka ndụ mmadụ.* 12Nʼihi nke a, a sịrị ndị Izrel, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti unu, maọbụ onye ọbịa ọbụla nke bi nʼetiti unu ga-eri ọbara.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.