Native Bible

Leviticus 15:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Ọ bụrụ na ọbara si nwanyị nʼahụ na-apụta agafee oge o kwesiri ịkwụsị maọbụ na ọ pụtara nʼoge ọ na-ekwesighị ịpụta, nwanyị ahụ ga-anọgide bụrụ onye rụrụ arụ ogologo ụbọchị ndị ahụ niile ọbara ahụ si ya nʼahụ na-apụta.

Leviticus 15:25 in English

Leviticus 15:25 · Berean Standard Bible

When a woman has a discharge of her blood for many days at a time other than her menstrual period, or if it continues beyond her period, she will be unclean all the days of her unclean discharge, just as she is during the days of her menstruation.

Context

23Ọ bụrụkwa na ọ bụ ihe ndina ya, maọbụ ihe ọzọ nke o ji nọdụ ala, onye ọbụla metụrụ ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. 24“ ‘Nwoke dinakwuru nwanyị ọbara si nʼahụ ya na-apụta, ọ bụrụ na ọbara ahụ emetụ ya, ọ ga-abụ onye rụrụ arụ abalị asaa. Ihe ndina ọbụla o dinara nʼelu ya ga-abụ ihe rụrụ arụ. 25“ ‘Ọ bụrụ na ọbara si nwanyị nʼahụ na-apụta agafee oge o kwesiri ịkwụsị maọbụ na ọ pụtara nʼoge ọ na-ekwesighị ịpụta, nwanyị ahụ ga-anọgide bụrụ onye rụrụ arụ ogologo ụbọchị ndị ahụ niile ọbara ahụ si ya nʼahụ na-apụta. 26Ihe ọbụla o dinara nʼelu ya mgbe ọbara si ya nʼahụ na-apụta, maọbụ ihe ọbụla ọ nọdụrụ ala nʼelu ya, ga-abụ ihe rụrụ arụ, dịka mgbe ọbara nke oge a kara aka. 27Onye ọbụla metụrụ ihe ndina ya maọbụ ihe ọ nọdụrụ ala nʼelu ya aka, ga-arụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asakwa uwe ya na ahụ ya mmiri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.