Levitikọs 15:27
Leviticus 15:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ọbụla metụrụ ihe ndina ya maọbụ ihe ọ nọdụrụ ala nʼelu ya aka, ga-arụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asakwa uwe ya na ahụ ya mmiri.
Leviticus 15:27 in English
Leviticus 15:27 · Berean Standard Bible
Anyone who touches these things will be unclean; he must wash his clothes and bathe with water, and he will be unclean until evening.
Context
25“ ‘Ọ bụrụ na ọbara si nwanyị nʼahụ na-apụta agafee oge o kwesiri ịkwụsị maọbụ na ọ pụtara nʼoge ọ na-ekwesighị ịpụta, nwanyị ahụ ga-anọgide bụrụ onye rụrụ arụ ogologo ụbọchị ndị ahụ niile ọbara ahụ si ya nʼahụ na-apụta. 26Ihe ọbụla o dinara nʼelu ya mgbe ọbara si ya nʼahụ na-apụta, maọbụ ihe ọbụla ọ nọdụrụ ala nʼelu ya, ga-abụ ihe rụrụ arụ, dịka mgbe ọbara nke oge a kara aka. 27Onye ọbụla metụrụ ihe ndina ya maọbụ ihe ọ nọdụrụ ala nʼelu ya aka, ga-arụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asakwa uwe ya na ahụ ya mmiri. 28“ ‘Mgbe ọbara ahụ kwụsịrị, ọ ga-agụ ụbọchị asaa site nʼoge ọ kwụsịrị. Mgbe abalị asaa ahụ zuru, ọ ga-abụ onye dị ọcha. 29Nʼụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewere nduru abụọ maọbụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, nye onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.