Levitikọs 15:23
Leviticus 15:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụkwa na ọ bụ ihe ndina ya, maọbụ ihe ọzọ nke o ji nọdụ ala, onye ọbụla metụrụ ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
Leviticus 15:23 in English
Leviticus 15:23 · Berean Standard Bible
And whether it is a bed or furniture on which she was sitting, whoever touches it will be unclean until evening.
Context
21Onye ọbụla metụrụ ihe ndina ya aka, ga-asa uwe ya na ahụ ya. Ọ ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. 22Onye metụrụ ihe o ji nọdụ ala aka ga-asa uwe ya na ahụ ya. Ọ ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. 23Ọ bụrụkwa na ọ bụ ihe ndina ya, maọbụ ihe ọzọ nke o ji nọdụ ala, onye ọbụla metụrụ ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. 24“ ‘Nwoke dinakwuru nwanyị ọbara si nʼahụ ya na-apụta, ọ bụrụ na ọbara ahụ emetụ ya, ọ ga-abụ onye rụrụ arụ abalị asaa. Ihe ndina ọbụla o dinara nʼelu ya ga-abụ ihe rụrụ arụ. 25“ ‘Ọ bụrụ na ọbara si nwanyị nʼahụ na-apụta agafee oge o kwesiri ịkwụsị maọbụ na ọ pụtara nʼoge ọ na-ekwesighị ịpụta, nwanyị ahụ ga-anọgide bụrụ onye rụrụ arụ ogologo ụbọchị ndị ahụ niile ọbara ahụ si ya nʼahụ na-apụta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.