Levitikọs 13:29
Leviticus 13:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọ bụrụ na nwoke maọbụ nwanyị ọbụla enwee ọnya nʼisi, maọbụ na nti ya,
Leviticus 13:29 in English
Leviticus 13:29 · Berean Standard Bible
If a man or woman has an infection on the head or chin,
Context
27Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-elezi onye ahụ anya nke ọma. Ọ bụrụ na ọ chọpụtara na ọnya ahụ na-abasaa nʼakpụkpọ ahụ ya, onye nchụaja ga-agụ onye ahụ dịka onye na-adịghị ọcha. Ọrịa na-emerụ emerụ ka ọ bụ. 28Ma ọ bụrụ na ọ gbanweghị, bụrụkwa na ọ basaghị nʼakpụkpọ ahụ ma ọ na-aṅacha, ọ bụ ihe ọzịza sitere nʼọkụ rere onye ahụ, onye nchụaja ga-agụ ya dịka onye dị ọcha, nʼihi na ọ bụ apa ọnya lara ala. 29“Ọ bụrụ na nwoke maọbụ nwanyị ọbụla enwee ọnya nʼisi, maọbụ na nti ya, 30onye nchụaja ga-elezi ọnya ahụ anya. Ọ bụrụ na ọ dị ala karịa akpụkpọ ahụ ya, ọ bụrụkwa na ajị dị na ya na-acha odo odo dị irighiri, onye nchụaja ga-agụ ha dịka ndị na-adịghị ọcha. Ọ bụ ọrịa na-emerụ emerụ nke dị nʼisi maọbụ nʼagba. 31Ma ọ bụrụ na onye nchụaja achọpụta na ọnya ahụ adịghị abasa abasa, maọbụ na ajị dị nʼebe ahụ adịghị eji ojii, onye nchụaja ga-edebe onye ahụ ụbọchị asaa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.