Native Bible

Leviticus 10:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ụmụ Erọn, Nadab na Abihu, were ọkụ tinye nʼihe ịgụ ọkụ ha, tinyekwa ụda na-esi isi nʼọkụ ahụ, si otu a chee ọkụ na-adịghị nsọ nʼihu Onyenwe anyị, nʼụzọ megidere ihe e nyere nʼiwu.

Leviticus 10:1 in English

Leviticus 10:1 · Berean Standard Bible

Now Aaron’s sons Nadab and Abihu took their censers, put fire in them and added incense, and offered unauthorized * fire before the LORD, contrary to His command.

Context

1Ma ụmụ Erọn, Nadab na Abihu, were ọkụ tinye nʼihe ịgụ ọkụ ha, tinyekwa ụda na-esi isi nʼọkụ ahụ, si otu a chee ọkụ na-adịghị nsọ nʼihu Onyenwe anyị, nʼụzọ megidere ihe e nyere nʼiwu. 2Nʼihi ya, ọkụ sitere nʼihu Onyenwe anyị daa rechapụ ha, ha nwụrụ nʼihu Onyenwe anyị. 3Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị bu nʼobi mgbe o kwuru sị, “ ‘Nʼetiti ndị niile na-abịaru m nso ka a ga-edo m nsọ ọ bụkwa nʼihu ọha mmadụ, ka a ga-asọpụrụ m.*’ ” Ma Erọn gbara nkịtị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.