Abụ Akwa 4:2
Lamentations 4:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee ka ụmụ ndị ikom Zayọn dị oke ọnụahịa, ndị dị oke ọnụahịa na mbụ dịka ọlaedo a nụchara anụcha, si dịrị ugbu a dịka ite aja nke ọkpụ ite kpụrụ.
Lamentations 4:2 in English
Lamentations 4:2 · Berean Standard Bible
How the precious sons of Zion, once worth their weight in pure gold, are now esteemed as jars of clay, the work of a potter’s hands!
Context
1Lee ka ọlaedo si chuo echu.
Lee ka ọlaedo makarịsịrị mma si gbanwee ghọọ ihe na-amakwaghị mma.
Nkume niile dị oke ọnụahịa nke ebe nsọ bụ
ndị a ghasara nʼisi okporoụzọ niile. 2Lee ka ụmụ ndị ikom Zayọn dị oke ọnụahịa,
ndị dị oke ọnụahịa na mbụ dịka ọlaedo a nụchara anụcha,
si dịrị ugbu a dịka ite aja
nke ọkpụ ite kpụrụ. 3Ọ bụladị ụmụ nkịta ọhịa na-eji ara ha
azụ ụmụ ha,
ma ndị a aghọọla ndị na-enweghị obi ebere;
ha aghọọla enyi nnụnụ nke na-ebi nʼọzara. 4Lee na ire nwa ọhụrụ na-arapara nʼakpo ọnụ ya
nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ.
Ụmụntakịrị na-arịọkwa ka e nye ha nri,
ma o nweghị onye na-enye ha nri ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.