Native Bible

Lamentations 4:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lee ka ọlaedo si chuo echu. Lee ka ọlaedo makarịsịrị mma si gbanwee ghọọ ihe na-amakwaghị mma. Nkume niile dị oke ọnụahịa nke ebe nsọ bụ ndị a ghasara nʼisi okporoụzọ niile.

Lamentations 4:1 in English

Lamentations 4:1 · Berean Standard Bible

How * the gold has become tarnished, the pure gold has become dull! The gems of the temple lie scattered on every street corner.

Context

1Lee ka ọlaedo si chuo echu. Lee ka ọlaedo makarịsịrị mma si gbanwee ghọọ ihe na-amakwaghị mma. Nkume niile dị oke ọnụahịa nke ebe nsọ bụ ndị a ghasara nʼisi okporoụzọ niile. 2Lee ka ụmụ ndị ikom Zayọn dị oke ọnụahịa, ndị dị oke ọnụahịa na mbụ dịka ọlaedo a nụchara anụcha, si dịrị ugbu a dịka ite aja nke ọkpụ ite kpụrụ. 3Ọ bụladị ụmụ nkịta ọhịa na-eji ara ha azụ ụmụ ha, ma ndị a aghọọla ndị na-enweghị obi ebere; ha aghọọla enyi nnụnụ nke na-ebi nʼọzara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.