Abụ Akwa 1:21
Lamentations 1:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ndị mmadụ anụla olu ịsụ ude m, ma o nweghị onye bịara ịkasị m obi. Ndị iro m niile anụla akụkọ ihe ọjọọ dakwasịrị m, ma ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ihe i mere ka ọ bịakwasị m. Mee ka ụbọchị ahụ i kara aka bịa, nke ga-eme ka ha dịrị ka m dị.
Lamentations 1:21 in English
Lamentations 1:21 · Berean Standard Bible
People have heard my groaning, but there is no one to comfort me. All my enemies have heard of my trouble; they are glad that You have caused it. May You bring the day You have announced, so that they may become like me.
Context
19“Akpọkuru m ndị mụ na ha dị na mma,
ma ha ghọgburu m.
Ndị nchụaja m na ndị okenye m
nwụrụ nʼime obodo
mgbe ha nọ na-achọta nri
ha ga-eji debe onwe ha ndụ. 20“Lee, Onyenwe anyị, ka m si bụrụ onye ahụhụ dị ukwuu dakwasịrị.
Ime anụ ahụ m na-anụ ọkụ,
obi m kwa enweghị izuike nʼime m
nʼihi na onye nnupu isi dị ukwuu ka m bụ.
Nʼezi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji mee ka mmadụ gbara aka nwa.
Ma nʼime ụlọ, ọ bụ naanị ọnwụ dị ya. 21“Ndị mmadụ anụla olu ịsụ ude m,
ma o nweghị onye bịara ịkasị m obi.
Ndị iro m niile anụla akụkọ ihe ọjọọ dakwasịrị m,
ma ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ihe i mere ka ọ bịakwasị m.
Mee ka ụbọchị ahụ i kara aka bịa,
nke ga-eme ka ha dịrị ka m dị. 22“Kwere ka ihe ọjọọ niile ha na-eme bịa nʼihu gị.
Mesokwa ha mmeso
dịka i si mesoo m
nʼihi mmehie niile nke m.
Nʼihi na ịsụ ude m dị ọtụtụ,
ana m adakwa mba nʼobi m.”
1:14 Maọbụ, ọ kpaala mmehie m niile dịka agbụ yoku
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.