Native Bible

Lamentations 1:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ndị mmadụ anụla olu ịsụ ude m, ma o nweghị onye bịara ịkasị m obi. Ndị iro m niile anụla akụkọ ihe ọjọọ dakwasịrị m, ma ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ihe i mere ka ọ bịakwasị m. Mee ka ụbọchị ahụ i kara aka bịa, nke ga-eme ka ha dịrị ka m dị.

Lamentations 1:21 in English

Lamentations 1:21 · Berean Standard Bible

People have heard my groaning, but there is no one to comfort me. All my enemies have heard of my trouble; they are glad that You have caused it. May You bring the day You have announced, so that they may become like me.

Context

19“Akpọkuru m ndị mụ na ha dị na mma, ma ha ghọgburu m. Ndị nchụaja m na ndị okenye m nwụrụ nʼime obodo mgbe ha nọ na-achọta nri ha ga-eji debe onwe ha ndụ. 20“Lee, Onyenwe anyị, ka m si bụrụ onye ahụhụ dị ukwuu dakwasịrị. Ime anụ ahụ m na-anụ ọkụ, obi m kwa enweghị izuike nʼime m nʼihi na onye nnupu isi dị ukwuu ka m bụ. Nʼezi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji mee ka mmadụ gbara aka nwa. Ma nʼime ụlọ, ọ bụ naanị ọnwụ dị ya. 21“Ndị mmadụ anụla olu ịsụ ude m, ma o nweghị onye bịara ịkasị m obi. Ndị iro m niile anụla akụkọ ihe ọjọọ dakwasịrị m, ma ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ihe i mere ka ọ bịakwasị m. Mee ka ụbọchị ahụ i kara aka bịa, nke ga-eme ka ha dịrị ka m dị. 22“Kwere ka ihe ọjọọ niile ha na-eme bịa nʼihu gị. Mesokwa ha mmeso dịka i si mesoo m nʼihi mmehie niile nke m. Nʼihi na ịsụ ude m dị ọtụtụ, ana m adakwa mba nʼobi m.” 1:14 Maọbụ, ọ kpaala mmehie m niile dịka agbụ yoku

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.