Abụ Akwa 1:20
Lamentations 1:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Lee, Onyenwe anyị, ka m si bụrụ onye ahụhụ dị ukwuu dakwasịrị. Ime anụ ahụ m na-anụ ọkụ, obi m kwa enweghị izuike nʼime m nʼihi na onye nnupu isi dị ukwuu ka m bụ. Nʼezi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji mee ka mmadụ gbara aka nwa. Ma nʼime ụlọ, ọ bụ naanị ọnwụ dị ya.
Lamentations 1:20 in English
Lamentations 1:20 · Berean Standard Bible
See, O LORD, how distressed I am! I am churning within; my heart is pounding within me, for I have been most rebellious. Outside, the sword bereaves; inside, there is death.
Context
18“Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume.
Ọ bụ mụ onwe m nupuru isi nʼiwu ya.
Geenụ ntị unu ndị niile,
leenụ anya nʼụdị ahụhụ dakwasịrị m.
A dọtala ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa m niile nʼagha
buru ha jee mba ọzọ. 19“Akpọkuru m ndị mụ na ha dị na mma,
ma ha ghọgburu m.
Ndị nchụaja m na ndị okenye m
nwụrụ nʼime obodo
mgbe ha nọ na-achọta nri
ha ga-eji debe onwe ha ndụ. 20“Lee, Onyenwe anyị, ka m si bụrụ onye ahụhụ dị ukwuu dakwasịrị.
Ime anụ ahụ m na-anụ ọkụ,
obi m kwa enweghị izuike nʼime m
nʼihi na onye nnupu isi dị ukwuu ka m bụ.
Nʼezi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji mee ka mmadụ gbara aka nwa.
Ma nʼime ụlọ, ọ bụ naanị ọnwụ dị ya. 21“Ndị mmadụ anụla olu ịsụ ude m,
ma o nweghị onye bịara ịkasị m obi.
Ndị iro m niile anụla akụkọ ihe ọjọọ dakwasịrị m,
ma ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ihe i mere ka ọ bịakwasị m.
Mee ka ụbọchị ahụ i kara aka bịa,
nke ga-eme ka ha dịrị ka m dị. 22“Kwere ka ihe ọjọọ niile ha na-eme bịa nʼihu gị.
Mesokwa ha mmeso
dịka i si mesoo m
nʼihi mmehie niile nke m.
Nʼihi na ịsụ ude m dị ọtụtụ,
ana m adakwa mba nʼobi m.”
1:14 Maọbụ, ọ kpaala mmehie m niile dịka agbụ yoku
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.