Native Bible

Lamentations 1:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume. Ọ bụ mụ onwe m nupuru isi nʼiwu ya. Geenụ ntị unu ndị niile, leenụ anya nʼụdị ahụhụ dakwasịrị m. A dọtala ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa m niile nʼagha buru ha jee mba ọzọ.

Lamentations 1:18 in English

Lamentations 1:18 · Berean Standard Bible

The LORD is righteous, for I have rebelled against His command. Listen, all you people; look upon my suffering. My young men and maidens have gone into captivity.

Context

16“Ọ bụ nke a mere m ji akwa akwa. Ọ bụ ya mekwara anya mmiri ji ju m anya. O nweghị onye nkasiobi ọbụla nọ m nso; o nwekwaghị onye ga-akpọghachi mkpụrụobi m. Ụmụ m atọgbọla nʼefu, nʼihi na onye iro emeriela.” 17Lee ka Zayọn si gbasapụ aka ya ma o nweghị onye nkasiobi o nwere. Onyenwe anyị enyela iwu banyere Jekọb na ndị agbataobi ya ga-aghọ ndị iro ya. Jerusalem aghọkwaala ihe rụrụ arụ nʼetiti ha. 18“Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume. Ọ bụ mụ onwe m nupuru isi nʼiwu ya. Geenụ ntị unu ndị niile, leenụ anya nʼụdị ahụhụ dakwasịrị m. A dọtala ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa m niile nʼagha buru ha jee mba ọzọ. 19“Akpọkuru m ndị mụ na ha dị na mma, ma ha ghọgburu m. Ndị nchụaja m na ndị okenye m nwụrụ nʼime obodo mgbe ha nọ na-achọta nri ha ga-eji debe onwe ha ndụ. 20“Lee, Onyenwe anyị, ka m si bụrụ onye ahụhụ dị ukwuu dakwasịrị. Ime anụ ahụ m na-anụ ọkụ, obi m kwa enweghị izuike nʼime m nʼihi na onye nnupu isi dị ukwuu ka m bụ. Nʼezi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji mee ka mmadụ gbara aka nwa. Ma nʼime ụlọ, ọ bụ naanị ọnwụ dị ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.