Abụ Akwa 1:18
Lamentations 1:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume. Ọ bụ mụ onwe m nupuru isi nʼiwu ya. Geenụ ntị unu ndị niile, leenụ anya nʼụdị ahụhụ dakwasịrị m. A dọtala ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa m niile nʼagha buru ha jee mba ọzọ.
Lamentations 1:18 in English
Lamentations 1:18 · Berean Standard Bible
The LORD is righteous, for I have rebelled against His command. Listen, all you people; look upon my suffering. My young men and maidens have gone into captivity.
Context
16“Ọ bụ nke a mere m ji akwa akwa.
Ọ bụ ya mekwara anya mmiri ji ju m anya.
O nweghị onye nkasiobi ọbụla nọ m nso;
o nwekwaghị onye ga-akpọghachi mkpụrụobi m.
Ụmụ m atọgbọla nʼefu,
nʼihi na onye iro emeriela.” 17Lee ka Zayọn si gbasapụ aka ya
ma o nweghị onye nkasiobi o nwere.
Onyenwe anyị enyela iwu banyere Jekọb
na ndị agbataobi ya ga-aghọ ndị iro ya.
Jerusalem aghọkwaala
ihe rụrụ arụ nʼetiti ha. 18“Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume.
Ọ bụ mụ onwe m nupuru isi nʼiwu ya.
Geenụ ntị unu ndị niile,
leenụ anya nʼụdị ahụhụ dakwasịrị m.
A dọtala ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa m niile nʼagha
buru ha jee mba ọzọ. 19“Akpọkuru m ndị mụ na ha dị na mma,
ma ha ghọgburu m.
Ndị nchụaja m na ndị okenye m
nwụrụ nʼime obodo
mgbe ha nọ na-achọta nri
ha ga-eji debe onwe ha ndụ. 20“Lee, Onyenwe anyị, ka m si bụrụ onye ahụhụ dị ukwuu dakwasịrị.
Ime anụ ahụ m na-anụ ọkụ,
obi m kwa enweghị izuike nʼime m
nʼihi na onye nnupu isi dị ukwuu ka m bụ.
Nʼezi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji mee ka mmadụ gbara aka nwa.
Ma nʼime ụlọ, ọ bụ naanị ọnwụ dị ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.