Native Bible

Lamentations 1:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lee ka Zayọn si gbasapụ aka ya ma o nweghị onye nkasiobi o nwere. Onyenwe anyị enyela iwu banyere Jekọb na ndị agbataobi ya ga-aghọ ndị iro ya. Jerusalem aghọkwaala ihe rụrụ arụ nʼetiti ha.

Lamentations 1:17 in English

Lamentations 1:17 · Berean Standard Bible

Zion stretches out her hands, but there is no one to comfort her. The LORD has decreed against Jacob that his neighbors become his foes. Jerusalem has become an unclean thing among them.

Context

15“Onyenwe anyị ajụla ndị niile bụ dike nʼagha nọ nʼetiti m. Ọ kpọkuola usuu ndị agha ka ha bịa buo agha megide m, ka ha bịa gwepịa ụmụ okorobịa m niile. Nʼebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị ya ka Onyenwe anyị zọchara ada Juda na-amaghị nwoke. 16“Ọ bụ nke a mere m ji akwa akwa. Ọ bụ ya mekwara anya mmiri ji ju m anya. O nweghị onye nkasiobi ọbụla nọ m nso; o nwekwaghị onye ga-akpọghachi mkpụrụobi m. Ụmụ m atọgbọla nʼefu, nʼihi na onye iro emeriela.” 17Lee ka Zayọn si gbasapụ aka ya ma o nweghị onye nkasiobi o nwere. Onyenwe anyị enyela iwu banyere Jekọb na ndị agbataobi ya ga-aghọ ndị iro ya. Jerusalem aghọkwaala ihe rụrụ arụ nʼetiti ha. 18“Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume. Ọ bụ mụ onwe m nupuru isi nʼiwu ya. Geenụ ntị unu ndị niile, leenụ anya nʼụdị ahụhụ dakwasịrị m. A dọtala ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa m niile nʼagha buru ha jee mba ọzọ. 19“Akpọkuru m ndị mụ na ha dị na mma, ma ha ghọgburu m. Ndị nchụaja m na ndị okenye m nwụrụ nʼime obodo mgbe ha nọ na-achọta nri ha ga-eji debe onwe ha ndụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.