Joshua 9:8
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha zara Joshua sị ya, “Anyị bụ ndị ohu unu.” Ma Joshua jụrụ ha ajụjụ sị, “Olee ndị unu bụ? Ebee ka unu si bịa?”
Joshua 9:8 in English
Joshua 9:8 · Berean Standard Bible
“We are your servants,” they said to Joshua. Then Joshua asked them, “Who are you and where have you come from?”
Context
6Mgbe ha bịaruru nʼebe ndị Izrel mara ụlọ ikwu ha na Gilgal, ha jekwuuru Joshua, gwa ya na ndị Izrel okwu sị ha, “Anyị si nʼala dị anya bịa. Ugbu a, biko anyị chọrọ ka anyị na unu gbaa ndụ.” 7Ndị ikom Izrel zaghachiri sị ndị Hiv* ahụ, “Olee otu anyị si amata na unu ebighị anyị nso? Ma eleghị anya unu bi anyị nso, anyị na unu ọ ga-esi aṅaa gbaa ndụ?” 8Ha zara Joshua sị ya, “Anyị bụ ndị ohu unu.”
Ma Joshua jụrụ ha ajụjụ sị, “Olee ndị unu bụ? Ebee ka unu si bịa?” 9Ha zara ya sị, “Ala anyị, ebe ndị ohu gị si bịa dị anya nke ukwuu. Anyị bịara nʼihi na anyị anụla akụkọ banyere Onyenwe anyị Chineke unu, na ihe niile o mere nʼIjipt. 10Anyị anụkwala ihe niile o mere eze abụọ ndị Amọrait, ndị nọ nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, Saịhọn eze Heshbọn, na Ọg eze Bashan, onye chịrị nʼAshtarọt.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.