Joshua 8:22
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị agha Izrel ahụ gara kpọọ obodo ahụ ọkụ pụtakwara, site nʼobodo ahụ, bido ịlụso ndị agha Ai ọgụ. Nke a mere ka ndị agha Ai nọdụ nʼetiti ụzọ ndị agha Izrel abụọ. Otu nʼihu ha, ndị nke ọzọ nʼazụ ha. Ya mere, ndị agha Izrel menyụrụ ha anya, gbuo ha, ruo na ọ dịkwaghị otu onye fọdụrụ nʼime ha, maọbụ onye gbapụrụ agbapụ.
Joshua 8:22 in English
Joshua 8:22 · Berean Standard Bible
Meanwhile, those in the ambush came out of the city against them, and the men of Ai were trapped between the Israelite forces on both sides. So Israel struck them down until no survivor or fugitive remained.
Context
20Ma mgbe ndị agha Ai lere anya nʼazụ, hụ ka anwụrụ ọkụ si nʼobodo ha na-alali elu, ha dara mba nʼime onwe ha. Ohere ọbụla adịghịkwa nye ha ịgbalaga gaa otu ụzọ maọbụ ụzọ ọzọ. Nʼihi na ndị Izrel ahụ buuru ụzọ gbaa ọsọ, ndị ahụ gbara na-aga nʼọzara, chigharịrị bido ịlụso ndị agha Ai ahụ na-achụ ha ọsọ ọgụ. 21Nʼihi na mgbe Joshua na ndị agha Izrel so ya lepụrụ anya hụ ka anwụrụ ọkụ si nʼobodo Ai na-arịgo elu, ha matara na ndị ha zoro onwe ha nʼọhịa abanyela obodo Ai, lụgbuo ya. Ya mere, Joshua na ndị agha so ya tụgharịrị bido igbu ndị agha obodo Ai. 22Ndị agha Izrel ahụ gara kpọọ obodo ahụ ọkụ pụtakwara, site nʼobodo ahụ, bido ịlụso ndị agha Ai ọgụ. Nke a mere ka ndị agha Ai nọdụ nʼetiti ụzọ ndị agha Izrel abụọ. Otu nʼihu ha, ndị nke ọzọ nʼazụ ha. Ya mere, ndị agha Izrel menyụrụ ha anya, gbuo ha, ruo na ọ dịkwaghị otu onye fọdụrụ nʼime ha, maọbụ onye gbapụrụ agbapụ. 23Naanị eze Ai ka e jidere na ndụ. A kpọtakwara ya bịaruo nʼebe Joshua nọ. 24Mgbe ndị agha Izrel gbusịrị ndị agha Ai niile nọ nʼọhịa na nʼọzara, ha lọghachiri azụ gbuo ndị niile fọdụrụ nʼime obodo ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.