Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ndị agha Izrel gbusịrị ndị agha Ai niile nọ nʼọhịa na nʼọzara, ha lọghachiri azụ gbuo ndị niile fọdụrụ nʼime obodo ahụ.

Joshua 8:24 in English

Joshua 8:24 · Berean Standard Bible

When Israel had finished killing all the men of Ai who had pursued them into the field and wilderness, and when every last one of them had fallen by the sword, all the Israelites returned to Ai and put it to the sword as well.

Context

22Ndị agha Izrel ahụ gara kpọọ obodo ahụ ọkụ pụtakwara, site nʼobodo ahụ, bido ịlụso ndị agha Ai ọgụ. Nke a mere ka ndị agha Ai nọdụ nʼetiti ụzọ ndị agha Izrel abụọ. Otu nʼihu ha, ndị nke ọzọ nʼazụ ha. Ya mere, ndị agha Izrel menyụrụ ha anya, gbuo ha, ruo na ọ dịkwaghị otu onye fọdụrụ nʼime ha, maọbụ onye gbapụrụ agbapụ. 23Naanị eze Ai ka e jidere na ndụ. A kpọtakwara ya bịaruo nʼebe Joshua nọ. 24Mgbe ndị agha Izrel gbusịrị ndị agha Ai niile nọ nʼọhịa na nʼọzara, ha lọghachiri azụ gbuo ndị niile fọdụrụ nʼime obodo ahụ. 25Ndị niile e gburu nʼụbọchị ahụ, ma nwoke ma nwanyị dị puku iri na abụọ. Ọ bụkwa ndị niile nọ nʼobodo ahụ ka e gburu. 26Nʼihi na Joshua nọgidere setịpụ ùbe o ji nʼaka ya, megide obodo Ai, tutu e bibie ndị niile nọ nʼobodo ahụ kpamkpam.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.