Joshua 8:17
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịkwaghị otu onye nwoke nke fọdụrụ na Ai maọbụ na Betel. Ha hapụkwara obodo ahụ ka o ghere oghe, gaa ịchụ ndị Izrel ọsọ.
Joshua 8:17 in English
Joshua 8:17 · Berean Standard Bible
Not a man was left in Ai or Bethel who did not go out after Israel, leaving the city wide open while they pursued Israel.
Context
15Joshua na ndị Izrel niile mere ka ha chụghachi ha azụ site nʼihu ha, ha gbara ọsọ na-aga akụkụ ọzara ahụ niile dịka ndị e meriri emeri. 16Nʼihi nke a, a kpọkuru ndị ikom niile nọ nʼime obodo Ai sị ha pụta bịa chụọ ụmụ Izrel ọsọ, ha chụrụ Joshua na-aga, e si otu a rapụta ha nʼebe dị anya site nʼobodo ahụ. 17Ọ dịkwaghị otu onye nwoke nke fọdụrụ na Ai maọbụ na Betel. Ha hapụkwara obodo ahụ ka o ghere oghe, gaa ịchụ ndị Izrel ọsọ. 18Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọrọ Joshua sị ya, “Setịpụ ùbe dị gị nʼaka nʼụzọ Ai, nʼihi na aga m enye gị obodo a.” Joshua mere dịka Onyenwe anyị gwara ya. 19Mgbe ndị agha ahụ zoro onwe ha nʼime ọhịa lere anya hụ na Joshua setịrị aka ya, ngwangwa, ha wụpụtara site nʼebe ha zoro onwe ha, gbara ọsọ gbaba nʼobodo Ai, merie ya, mụnye ya ọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.