Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ndị agha ahụ zoro onwe ha nʼime ọhịa lere anya hụ na Joshua setịrị aka ya, ngwangwa, ha wụpụtara site nʼebe ha zoro onwe ha, gbara ọsọ gbaba nʼobodo Ai, merie ya, mụnye ya ọkụ.

Joshua 8:19 in English

Joshua 8:19 · Berean Standard Bible

and as soon as he did so, the men in ambush rose quickly from their position. They rushed forward, entered the city, captured it, and immediately set it on fire.

Context

17Ọ dịkwaghị otu onye nwoke nke fọdụrụ na Ai maọbụ na Betel. Ha hapụkwara obodo ahụ ka o ghere oghe, gaa ịchụ ndị Izrel ọsọ. 18Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọrọ Joshua sị ya, “Setịpụ ùbe dị gị nʼaka nʼụzọ Ai, nʼihi na aga m enye gị obodo a.” Joshua mere dịka Onyenwe anyị gwara ya. 19Mgbe ndị agha ahụ zoro onwe ha nʼime ọhịa lere anya hụ na Joshua setịrị aka ya, ngwangwa, ha wụpụtara site nʼebe ha zoro onwe ha, gbara ọsọ gbaba nʼobodo Ai, merie ya, mụnye ya ọkụ. 20Ma mgbe ndị agha Ai lere anya nʼazụ, hụ ka anwụrụ ọkụ si nʼobodo ha na-alali elu, ha dara mba nʼime onwe ha. Ohere ọbụla adịghịkwa nye ha ịgbalaga gaa otu ụzọ maọbụ ụzọ ọzọ. Nʼihi na ndị Izrel ahụ buuru ụzọ gbaa ọsọ, ndị ahụ gbara na-aga nʼọzara, chigharịrị bido ịlụso ndị agha Ai ahụ na-achụ ha ọsọ ọgụ. 21Nʼihi na mgbe Joshua na ndị agha Izrel so ya lepụrụ anya hụ ka anwụrụ ọkụ si nʼobodo Ai na-arịgo elu, ha matara na ndị ha zoro onwe ha nʼọhịa abanyela obodo Ai, lụgbuo ya. Ya mere, Joshua na ndị agha so ya tụgharịrị bido igbu ndị agha obodo Ai.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.