Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi nke a, a kpọkuru ndị ikom niile nọ nʼime obodo Ai sị ha pụta bịa chụọ ụmụ Izrel ọsọ, ha chụrụ Joshua na-aga, e si otu a rapụta ha nʼebe dị anya site nʼobodo ahụ.

Joshua 8:16 in English

Joshua 8:16 · Berean Standard Bible

Then all the men of Ai were summoned to pursue them, and they followed Joshua and were drawn away from the city.

Context

14Mgbe eze Ai hụrụ nke a, ya na ndị ikom obodo ahụ niile mere ngwangwa pụọ nʼisi ụtụtụ izute ndị Izrel nʼotu ebe, nke chere ihu nʼAraba. Ma ọ mataghị na o nwere ndị agha zubere imegide ya ndị zoro onwe ha nʼọhịa dị nʼazụ obodo. 15Joshua na ndị Izrel niile mere ka ha chụghachi ha azụ site nʼihu ha, ha gbara ọsọ na-aga akụkụ ọzara ahụ niile dịka ndị e meriri emeri. 16Nʼihi nke a, a kpọkuru ndị ikom niile nọ nʼime obodo Ai sị ha pụta bịa chụọ ụmụ Izrel ọsọ, ha chụrụ Joshua na-aga, e si otu a rapụta ha nʼebe dị anya site nʼobodo ahụ. 17Ọ dịkwaghị otu onye nwoke nke fọdụrụ na Ai maọbụ na Betel. Ha hapụkwara obodo ahụ ka o ghere oghe, gaa ịchụ ndị Izrel ọsọ. 18Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọrọ Joshua sị ya, “Setịpụ ùbe dị gị nʼaka nʼụzọ Ai, nʼihi na aga m enye gị obodo a.” Joshua mere dịka Onyenwe anyị gwara ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.