Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu mere ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu unu tutu ruo mgbe unu gafesịrị nʼofe nke ọzọ. Onyenwe anyị Chineke unu mere osimiri Jọdan ihe o mere osimiri Uhie* mgbe o mere ka osimiri Uhie takpọọ nʼihu anyị, tutu ruo mgbe anyị gafesịrị nʼofe ya nke ọzọ.

Joshua 4:23 in English

Joshua 4:23 · Berean Standard Bible

For the LORD your God dried up the waters of the Jordan before you until you had crossed over, just as He did to the Red Sea,* which He dried up before us until we had crossed over.

Context

21Ọ sịrị ndị Izrel, “Nʼoge dị nʼihu, mgbe ụmụ unu ga-ajụ ndị bụ nna ha ajụjụ sị, ‘Gịnị ka nkume ndị a pụtara, Gịnịkwa ka ha na-egosi?’ 22Gwa ha, ‘Izrel gafere osimiri Jọdan nʼala akọrọ.’ 23Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu mere ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu unu tutu ruo mgbe unu gafesịrị nʼofe nke ọzọ. Onyenwe anyị Chineke unu mere osimiri Jọdan ihe o mere osimiri Uhie* mgbe o mere ka osimiri Uhie takpọọ nʼihu anyị, tutu ruo mgbe anyị gafesịrị nʼofe ya nke ọzọ. 24O mere ihe ndị a niile ka ndị niile bi nʼelu ụwa mata na aka Onyenwe anyị dị ike.* O mekwara ya ka unu onwe unu tụọ egwu Onyenwe anyị Chineke unu, mgbe niile.”* 4:23 Ọpụ 14:21 4:24 1Ez 8:42; Abụ 106:8; 89:13; Ọpụ 15:16 4:24 Ọpụ 14:14; Dit 6:2; Abụ 76:6

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.