Joshua 4:22
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gwa ha, ‘Izrel gafere osimiri Jọdan nʼala akọrọ.’
Joshua 4:22 in English
Joshua 4:22 · Berean Standard Bible
you are to tell them, ‘Israel crossed the Jordan on dry ground.’
Context
20Nkume iri na abụọ ahụ ha si nʼosimiri Jọdan buputa, ka Joshua guzobere na Gilgal. 21Ọ sịrị ndị Izrel, “Nʼoge dị nʼihu, mgbe ụmụ unu ga-ajụ ndị bụ nna ha ajụjụ sị, ‘Gịnị ka nkume ndị a pụtara, Gịnịkwa ka ha na-egosi?’ 22Gwa ha, ‘Izrel gafere osimiri Jọdan nʼala akọrọ.’ 23Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu mere ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu unu tutu ruo mgbe unu gafesịrị nʼofe nke ọzọ. Onyenwe anyị Chineke unu mere osimiri Jọdan ihe o mere osimiri Uhie* mgbe o mere ka osimiri Uhie takpọọ nʼihu anyị, tutu ruo mgbe anyị gafesịrị nʼofe ya nke ọzọ. 24O mere ihe ndị a niile ka ndị niile bi nʼelu ụwa mata na aka Onyenwe anyị dị ike.* O mekwara ya ka unu onwe unu tụọ egwu Onyenwe anyị Chineke unu, mgbe niile.”*
4:23 Ọpụ 14:21
4:24 1Ez 8:42; Abụ 106:8; 89:13; Ọpụ 15:16
4:24 Ọpụ 14:14; Dit 6:2; Abụ 76:6
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.