Joshua 22:5
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma lezienụ anya nke ọma idebe iwu na ụkpụrụ niile nke Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu: nke bụ ịhụ Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya, ịga ije nʼirube isi nye ya, irube isi nʼiwu ya niile, ịdabere na ya, na iji obi unu niile na mkpụrụobi unu niile fee ya ofufe.”
Joshua 22:5 in English
Joshua 22:5 · Berean Standard Bible
But be very careful to observe the commandment and the law that Moses the servant of the LORD gave you: to love the LORD your God, to walk in all His ways, to keep His commandments, to hold fast to Him, and to serve Him with all your heart and with all your soul.”
Context
3E, unu arụzuola ọrụ ahụ Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu. Unu ahapụghị ụmụnna unu nʼọgbọ agha ogologo ụbọchị ndị a niile. 4Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke unu enyela ụmụnna unu mmeri. O meekwala ka ha zuru ike dịka o kwere nkwa na ọ ga-eme. Ugbu a, laghachinụ nʼụlọ unu, laghachikwanụ nʼala unu, ala ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan. 5Ma lezienụ anya nke ọma idebe iwu na ụkpụrụ niile nke Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu: nke bụ ịhụ Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya, ịga ije nʼirube isi nye ya, irube isi nʼiwu ya niile, ịdabere na ya, na iji obi unu niile na mkpụrụobi unu niile fee ya ofufe.” 6Ya mere, Joshua gọziri ha, zipụ ha, ha lakwara nʼụlọ nke aka ha. 7Ọkara ebo Manase ka Mosis nyere ihe nketa nke ha nʼime ala Bashan, ma ọkara ebo Manase nke ọzọ nwetara ihe nketa nke ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan. Mgbe Joshua na-ezilaga ha nʼụlọ ha, ọ gọziri ha, gwa ha okwu sị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.