Joshua 22:7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọkara ebo Manase ka Mosis nyere ihe nketa nke ha nʼime ala Bashan, ma ọkara ebo Manase nke ọzọ nwetara ihe nketa nke ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan. Mgbe Joshua na-ezilaga ha nʼụlọ ha, ọ gọziri ha, gwa ha okwu sị,
Joshua 22:7 in English
Joshua 22:7 · Berean Standard Bible
(To the half-tribe of Manasseh Moses had given land in Bashan, and to the other half Joshua gave land on the west side of the Jordan among their brothers.) When Joshua sent them to their homes he blessed them,
Context
5Ma lezienụ anya nke ọma idebe iwu na ụkpụrụ niile nke Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu: nke bụ ịhụ Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya, ịga ije nʼirube isi nye ya, irube isi nʼiwu ya niile, ịdabere na ya, na iji obi unu niile na mkpụrụobi unu niile fee ya ofufe.” 6Ya mere, Joshua gọziri ha, zipụ ha, ha lakwara nʼụlọ nke aka ha. 7Ọkara ebo Manase ka Mosis nyere ihe nketa nke ha nʼime ala Bashan, ma ọkara ebo Manase nke ọzọ nwetara ihe nketa nke ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan. Mgbe Joshua na-ezilaga ha nʼụlọ ha, ọ gọziri ha, gwa ha okwu sị, 8“Werenụ ọtụtụ akụ unu lụtara nʼagha laa. Mgbe unu ruru, kenyenụ ndị ikwu unu ụfọdụ ihe site nʼime akụ ndị iro unu a.” Nʼihi na ihe ha kwatara nʼagha dị ukwuu: igwe anụ ụlọ, na ọlaọcha, na ọlaedo, na bronz, na igwe, na uwe dị iche iche. 9Ya mere, ndị agha Ruben na Gad, na ọkara ebo Manase, hapụrụ ndị agha Izrel na Shaịlo, nʼime ala Kenan, nʼofe osimiri Jọdan, laghachi nʼala nke ha dị na Gilead, nke ha nwetara dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.