Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nke a bụ nzaghachi ụmụ Ruben, na ụmụ Gad na ọkara ebo ụmụ Manase, nyere ndị ndu ụmụ Izrel niile;

Joshua 22:21 in English

Joshua 22:21 · Berean Standard Bible

Then the Reubenites, the Gadites, and the half-tribe of Manasseh answered the leaders of the clans of Israel:

Context

19Ọ bụrụ na unu wuru ebe ịchụ aja ahụ nʼihi na ala unu rụrụ arụ, bịakwutenụ anyị nʼakụkụ nke ọzọ, nke osimiri a, ebe Onyenwe anyị bi nʼetiti anyị, nʼime ụlọ nzute obibi ya. Anyị ga-ekenyekwa unu ala anyị. Ma unu enupula isi megide Onyenwe anyị site nʼiwu ebe ịchụ aja ọzọ, ebe ọ bụ na e nwere otu ebe bụ ezi ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị Chineke anyị. 20Mgbe Ekan, nwa Zera, zipụtara onwe ya dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼihe metụtara ihe e doro nsọ, ọ bụ na nzukọ Izrel niile esoghị keta oke nʼahụhụ dakwasịrị ya? Ọ bụghị naanị ya nwụrụ nʼihi mmehie ahụ.’ ” 21Nke a bụ nzaghachi ụmụ Ruben, na ụmụ Gad na ọkara ebo ụmụ Manase, nyere ndị ndu ụmụ Izrel niile; 22“Chineke onye kachasị chi niile, bụ Onyenwe anyị! Chineke onye kachasị chi niile, bụ Onyenwe anyị! Ya onwe ya maara, ka Izrel niile matakwa. A sị na nke a bụ nnupu isi, a sịkwarị na ọ bụ enweghị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, unu ahapụla anyị ka anyị dịrị ndụ. 23Ọ bụrụ na anyị sitere na nnupu isi wuo ebe ịchụ aja a maka ịchụ aja udo maọbụ aja mkpụrụ ọka, ka Onyenwe anyị nʼonwe ya taa anyị ahụhụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.