Joshua 22:20
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Ekan, nwa Zera, zipụtara onwe ya dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼihe metụtara ihe e doro nsọ, ọ bụ na nzukọ Izrel niile esoghị keta oke nʼahụhụ dakwasịrị ya? Ọ bụghị naanị ya nwụrụ nʼihi mmehie ahụ.’ ”
Joshua 22:20 in English
Joshua 22:20 · Berean Standard Bible
Was not Achan * son of Zerah unfaithful regarding what was set apart for destruction,* bringing wrath upon the whole congregation of Israel? Yet it was not only Achan who perished because of his sin!’”
Context
18Ugbu a, unu na-achọkwa isite nʼebe Onyenwe anyị nọ chigharịa.
“ ‘Ọ bụrụ na unu enupu isi megide Onyenwe anyị taa, matakwanụ na echi ya, ọ ga-eweso nzukọ Izrel niile iwe. 19Ọ bụrụ na unu wuru ebe ịchụ aja ahụ nʼihi na ala unu rụrụ arụ, bịakwutenụ anyị nʼakụkụ nke ọzọ, nke osimiri a, ebe Onyenwe anyị bi nʼetiti anyị, nʼime ụlọ nzute obibi ya. Anyị ga-ekenyekwa unu ala anyị. Ma unu enupula isi megide Onyenwe anyị site nʼiwu ebe ịchụ aja ọzọ, ebe ọ bụ na e nwere otu ebe bụ ezi ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị Chineke anyị. 20Mgbe Ekan, nwa Zera, zipụtara onwe ya dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼihe metụtara ihe e doro nsọ, ọ bụ na nzukọ Izrel niile esoghị keta oke nʼahụhụ dakwasịrị ya? Ọ bụghị naanị ya nwụrụ nʼihi mmehie ahụ.’ ” 21Nke a bụ nzaghachi ụmụ Ruben, na ụmụ Gad na ọkara ebo ụmụ Manase, nyere ndị ndu ụmụ Izrel niile; 22“Chineke onye kachasị chi niile, bụ Onyenwe anyị! Chineke onye kachasị chi niile, bụ Onyenwe anyị! Ya onwe ya maara, ka Izrel niile matakwa. A sị na nke a bụ nnupu isi, a sịkwarị na ọ bụ enweghị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, unu ahapụla anyị ka anyị dịrị ndụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.