Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel ala ahụ ọ ṅụrụ iyi inye ndị nna nna ha. Ha nwetara ya, biri nʼime ya.

Joshua 21:43 in English

Joshua 21:43 · Berean Standard Bible

Thus the LORD gave Israel all the land He had sworn to give their fathers, and they took possession of it and settled in it.

Context

41Ọnụọgụgụ obodo niile na ebe ịta nri nke anụ ụlọ e sitere nʼala ụmụ Izrel nye ndị Livayị dị iri anọ na asatọ. 42Obodo ọbụla nwere ala gbara ya gburugburu ebe anụ ụlọ ga-anọ kpaa nri. 43Ya mere, Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel ala ahụ ọ ṅụrụ iyi inye ndị nna nna ha. Ha nwetara ya, biri nʼime ya. 44Onyenwe anyị nyere ha izuike nʼakụkụ niile, dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye ndị nna nna ha. Ọ dịkwaghị otu nʼime ndị iro ha ọbụla guzogidere ha, nʼihi na Onyenwe anyị nyefere ndị iro ha niile nʼaka ha. 45O nweghị otu nʼime nkwa ọma niile Onyenwe anyị kwere Izrel nke na-emezughị. O mezuru nkwa niile o kwere ha. 21:20 Ndị a abụghị ndị nchụaja nʼihi na ha e sighị nʼagbụrụ Erọn. Ọnụ 26:57; 1Ih 6:1,66-70

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.